Psalms 123

Abụ nrigo.

Ekpere maka ebere

1Ana m eweli anya m abụọ elu ile gị,
gị onye ocheeze ya dị nʼeluigwe.
2Dịka ohu si elekwasị nna ya ukwu anya ya,
na dịka ohu nwanyị na-eje ozi si elekwasị nne ya ukwu anya, ịnata ozi ọ ga-eje,
Nʼoge ochie, ndị nwere ohu adịghị e kwuru ha okwu mgbe a na-ezi ha ozi, kama ọ bụ aka ka nne ha ukwu maọbụ nna ha ukwu ji agwa ha ihe ha kwesiri ime.

otu a ka anyị si na-elekwasị Onyenwe anyị bụ Chineke anyị anya,
ruo mgbe ọ ga-emere anyị ebere.

3Meere anyị ebere, O Onyenwe anyị, meere anyị ebere,
nʼihi na anyị abụrụla ndị a na-akọcha akọcha.
4Nʼihi na nnagide anyị na-anagide
ịchị ọchị ndị nganga,
na ileda anya ndị mpako adịla ukwuu.
Copyright information for IboBIU